Lexicon · 9 entries
G
- ga
- enc. optional plural marker: Ife ndị à gà sị̀ bụ̀chà ǹkè m All these things are mine Ndị à bụ̀gàsị̀ ǹkè m lị̀ These things are all really mine, you know
- -ga1v
- A. go; pass; move B. be beyond; be farther off
ọ̀gịga a pass; passing
-ga àzụ be retrogressive, not making good progress
-gaba go on; continue to go; henceforth; thenceforth: Mèlu gàba etu m̄bụ Continue as hitherto!
-gabìdo go in front and intercept
-gabìga (cf. - go in front of; overtake
gafèga)
ngabìga passing over; Passover
-gabulu n’iru go before, carrying something
-gadobe, -gadebe -gadòbe, -gadèbe -gafè stop moving move nearer cross; pass (away, over, through)
-gafèga go in front of; overtake
-gafè okè be in excess: Ife gafèlụ̀ okè dị̀ njọ Enough is as good as a feast
-gafèta come over
-gaghalị wander; stroll
-gakọ pass towards
-ga(lụ) aga be past; ago
arọ̄ gālụ aga last year: Ọ mụ̀lụ̀ èjìma n’arọ̄ gālụ aga She gave birth to twins last year
ife gālụ aga past event; past thing
ọnwa gālụ aga last month: Ọ bị̀àlụ̀ ebe à n’ọnwa gālụ aga He came here last month
ụkā gālụ aga last week
-gamì go in; pass deeply; travel inland
-ga n’iru go forward; go in front; progress
ịgāniiru progress
ọ̀gàniiru progress
-ga ọ̀fụma prosper; succeed; go well
-garube surround; go round
-garụka go a short distance; go aside (esp. for discussion)
-gata pass here (towards speaker): Nye m̄efè kà m gata Let me pass!
-gatè aka go far away
-gawa pass, go, straight on
-gawaga pass, go, straight on
-gawalụ go away
-gazù go through
-gabìga come round to intercept someone
-kpụmìga move farther off: Bikō kpụmìga! Please move farther off!
- -ga2v
- thread (so as to hold together: Bikō mèghe ụzọ̀ kà nne ānyị wèlu fụ ụzọ̀ ga ife onu# ya Please open the door so as to allow our mother to see well to thread her necklace
-gado hold together
-gado aka hold someone responsible: Ọ gàdò m̀ aka He held me responsible
-gado ezē grip (but not bite into) with teeth
-gakọ thread, string (together)
- -ga3aux. v
- (probably originates from -ga 1.) marks the future verb forms: Chikē gà-àbịa Chike will come (future affirmative): Chikē agā-abịa Chike will not come (future negative): Chikē gà na-ègo jī Chikē will be (habitually) buying yams (future progressive affirmative): Ụzọ̀ kpùchìsị̀lị̀ ụnọ̀ ya, mmilī agā naabā yā Ụzọ roofed his house so that rain might not come in (future progressive negative): Chikē gà-ègogo jī Chike will/must have bought yams (future perfect, affirmative): Chikē gà na-ègogo jī Chike will/must have been (habitually) buying yams (future progressive perfect affirmative)
- -gà +v
- scratch
-gàdo hold with nails, claws, or teeth
-gà mbọ scratch with nails
-ga-cha take off
-gachata snatch off
- -gà-la1
- be proud
-gàla ngàla be proud
- -gà-la +
- 2.
-gàla ọnụ̄ be dear: Nni gàlàlụ̀ ọnụ n’ebe à Food is dear here
ǹgàla ọ̄nụ dearness
- gànàgànàn
- staggering walk
-sọ gànàgànà stagger
- gàrịn
- dried and grated cassava; gari